Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 16
Abụ miktam nke Devid.
Ekpere maka iguzosi ike
Chebe m, O Chineke,
nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ.
A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m,
e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.”
Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a,
“Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ.”
Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba.
Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara1 nye chi ndị a,
maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha.
Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m;2
ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza.
Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma;
nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.
Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ;
ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme.
Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.
Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.
Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ;
aga m anọkwa nʼudo.
Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ,
ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi3 hụ ire ure.
I gosila m ụzọ ndụ;
ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị;
ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.
Source notes (3)
- Footnote Nʼọtụtụ mba, mmanya bụ ihe e ji agọ ọfọ, ma nʼomenaala mba ụfọdụ, ọbara onye ahụ eji achụ aja ka a na-ewere gwakọọ na mmanya, wụpụ nʼebe ịchụ aja, nke ka a maara dịka aja ọbara. Ọ bụ omenaala mba ndị ahụ na-amaghị Chineke ka onye dere abụ ọma a na-emegide. Lev 18:21; Lev 20:1-2; 2Ez 16:3; 2Ez 23:10.
- Footnote Iko a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe a bụ iko a na-enye ndị akpọrọ oriri nʼoge mmemme. Dan 5:1-4
- Footnote Maọbụ, onye gị dị nsọ
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.