Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 15
Abụ Ọma Devid.
Onye ga-ebi nʼugwu nsọ Onyenwe anyị?
Onyenwe anyị, onye pụrụ ịnọgide nʼụlọnsọ ukwu gị?
Onye pụrụ ibi nʼugwu nsọ gị?
Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta,
onye na-arụ ọrụ ezi omume,
onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya.
Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ,
onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ,
na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya,
onye na-eleda onye ajọ omume anya,
ma na-asọpụrụ ndị ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị,
onye na-adịghị agbanwe nkwa ọbụla o kwere,
ọ bụladị mgbe nkwa ahụ na-emegide ya,
onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma,
onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha.
Onye na-eme ihe ndị a
agaghị ama jijiji nʼọnọdụ ya, mgbe ọbụla.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.