Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 14
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.
Ajọ omume nke ndị na-emebi iwu
Onye nzuzu na-asị1 nʼime obi ya,
“Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.”
Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ọrụ aka ha niile bụkwa ihe arụ;
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.
Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe
na-ele ụmụ mmadụ anya
ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta
onye nke na-achọ Chineke.
Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ;
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi,
ọ dịghị ọ bụladị, otu onye.
Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe?
Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri,
ha adịghị akpọkukwa Onyenwe anyị.
Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu,
nʼihi na Chineke nọ nʼetiti ndị ezi omume.
Unu ndị ajọ omume na-emebi atụmatụ ndị ogbenye,
ma Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba ha.
A sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta!
Mgbe Onyenwe anyị ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha,
ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!
Source notes (1)
- Footnote Maọbụ, na-eche
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.