Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 13
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.
Ekpere maka nnapụta
Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m Onyenwe anyị?
Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị?1
Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba
nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m?
Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m?
Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m.
Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ;
mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,”
mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ.
Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ;
mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị.
Aga m abụku Onyenwe anyị abụ,
nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.
Source notes (1)
- Footnote Job 13:24; Abụ 89:46
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.