Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 139
Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.
Chineke maara ihe niile
O Onyenwe anyị, ị nyochaala m,
ị makwaara m nke ọma
Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ;
site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile.
Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m;
ị mazukwara ụzọ m niile.
O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwu
tupu m kwuo ya.
Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ,
ị tụkwasịla m aka gị.
Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m,
ọ dịkwa elu apụghị m iru ya.
Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị?
Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m?
Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ.
Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ.
Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa
nʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri,
ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m
aka nri gị ga-ejidesi m ike.
Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m
ìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu.”
Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ;
abalị ga-enye ìhè dịka ehihie,
nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.1
Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.
Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.
Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;
ọrụ gị niile dị ebube;
amaara m nke a nke ọma.
Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ
mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ,
mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.
Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla.
E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị
tupu otu nʼime ha adịrị.
Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke!
Leekwa ka ha si dị ukwuu.
Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ,
ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala.
Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.
O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi!
Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara!
Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị;
ndị iro gị na-ekwutọ aha gị.
O Onyenwe anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị,
na-asọkwa ndị na-enupu isi megide gị oyi?
Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ?
Ana m agụnye ha dịka ndị iro m.
O Chineke, nyochaa m, mara obi m.
Nwaa m, matakwa echiche uche m niile.
Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m,
ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.
Source notes (1)
- Footnote Job 26:6; Job 34:22; Hib 4:13
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.