Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 138

Abụ Ọma Devid.

Onyenwe anyị bụ onye kwesiri ntụkwasị obi

O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị;

nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto.

Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị

aga m etokwa aha gị

nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị,

nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị

dị elu karịa ihe niile.1

Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m;

i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike.

O Onyenwe anyị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị,

mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu.

Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị,

nʼihi na ebube Onyenwe anyị dị ukwuu.

Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya,

ma ọ naghị ekwe ka ndị nganga bịa ya nso.

A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu,

ị na-echebe ndụ m;

ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị,

ị na-eji aka nri gị zọpụta m.2

Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m;3

ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

ahapụkwala ọrụ aka gị niile.

Source notes (3)
  1. Footnote Aịz 42:21
  2. Footnote Abụ 23:3-4
  3. Footnote Fil 1:6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.