Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 137
Abụ ndị a dọtara nʼagha
Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa
mgbe anyị chetara Zayọn.
Ọ bụ nʼosisi pọpla
ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile.
Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ,
ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ;
ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!”
Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị
ebe anyị nọ nʼala ọzọ?
Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem,
ka aka nri m chefuo ǹka ya.
Ọ bụrụ na m echezọọ gị,
ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche
banyere Jerusalem, oke ọṅụ m,
ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m.
Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere
nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha.1
“Tikpọsịa ya,” ka ha tiri,
“Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!”
Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi,
ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị
nʼihi ihe i mere anyị,
onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ ara
tụpịa ha nʼelu nkume.2
Source notes (2)
- Footnote Mgbe Nebukadneza meriri Jerusalem, ma bibiekwa ya, ndị Edọm ṅụrịrị oke ọnụ nʼihi na ndị Izrel bụ ndị iro ha. Ma omume a ezighị ezi nʼihi na ndị Edọm na ndị Izrel bụ ụmụnna. Ndị Edọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, Izk 25:12-14; Ems 1:11; Ọbd 10-14
- Footnote Nʼoge agha, ndị meriri nʼagha na-achịkọta ụmụaka niile dị nʼobodo ahụ ha meriri, tụpịasịa ha isi na nkume. Ha na-eme nke a i ji mesie mmeri ha meriri obodo ahụ ike, nakwa i ji mee ka a ghara inwe ọgbọ ọzọ ga-ebili nʼobodo ahụ. 2Ez 8:12; Aịz 13:16; Hos 13:16; Nhu 3:10
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.