Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 136

Abụ ekele

Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma.

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu.

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche,

ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha;

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya,

nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile;

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Na Ọg eze Bashan,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Were ala ha nye dịka ihe nketa,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele.

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.