Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 140
Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.
Ekpere maka nchebe
O Onyenwe anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ.
Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche.
Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha
na-akpali agha ụbọchị niile.
Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ;
elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha.1 Sela
Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu;
chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike,
ndị na-eche echiche ọdịda m.
Ndị mpako esielera m ọnya igbudu;
ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha,
siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. Sela
A sịrị m Onyenwe anyị, “Gị onwe gị bụ Chineke m.”
Nụrụ, O Onyenwe anyị, olu arịrịọ m maka amara.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike,
ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha.
Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị,
ekwekwala ka nzube ha mezuo. Sela
Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga
ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha.
Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha;
ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere,
nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ.
Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala,
ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike.
Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye
na-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha.
Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị,
ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.
Source notes (1)
- Footnote Rom 3:13; Jem 3:8
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.