Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 103
Abụ Ọma Devid.
Gọzie Onyenwe anyị
Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;
ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.
Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;
echefukwala mmeso ọma ya niile,
ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile;
na-agwọkwa gị ọrịa gị niile,
onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu
werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze,
onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile,
ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.1
Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume,
na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu.
O mere ka Mosis mata ụzọ ya,
mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche:
Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara.
Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya.
Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta;
ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị,
ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị.
Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,
otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ.
Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ,
otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.
Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ,
otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,
nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị,
ọ na-echeta na anyị bụ aja.
Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa,
ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa,
ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa,
adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya.
Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site
nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya.
Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,
nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya
na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.
Onyenwe anyị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe,
alaeze ya na-achị ihe niile.
Toonu Onyenwe anyị, unu ndị mmụọ ozi ya,
unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ,
na-erubere okwu ya isi.
Toonu Onyenwe anyị unu usuu ndị agha ya niile;
unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme uche ya.
Toonu Onyenwe anyị, ọrụ aka ya niile
nʼebe ọbụla ọ na-achị.
Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.
Source notes (1)
- Footnote Ugo Ọ bụ ịdị ike na ndụ ogologo ka e ji mara nnụnụ ugo.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.