Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 104

Toonu Chineke onye okike

Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.

O Onyenwe anyị na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu;

ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe.

Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa;

ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu

na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri.1

Ọ na-eji igwe ojii emere onwe ya ụgbọ agha

na-ejirikwa nku nke ifufe felie elu.

O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi,

meekwa ka ọkụ na-enwu enwu bụrụ ndị na-ejere ya ozi.

Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa;

agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya.

I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya,

mmiri tokpukwara ugwu niile.

Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ,

nʼụda oke olu nke egbe eluigwe gị, ha gbapụrụ ọsọ.

Ha sitere nʼelu ugwu niile,

sọrọ gaa na ndagwurugwu,

ruokwa nʼebe ahụ ị kpara oke na ha ga-anọ.

Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe,

gbochie ha ikpuchi elu ụwa ọzọ.

Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu,

meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe.

Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ọṅụṅụ

bụrụkwa ebe akpịrị ịkpọ nkụ nke ịnyịnya ibu ọhịa na-adajụ.

Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha;

nọrọkwa nʼalaka ha bụọ abụ.

Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile;

ụwa niile na-ejupụtakwa na mkpụrụ nke ọrụ aka ya.

Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ,

na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya,

ime ka nri site nʼala pupụta;

mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị,

mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma,

na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi.

A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma,

osisi sida nke Lebanọn nke ọ kụrụ.

Ụmụ nnụnụ na-ewu akwụ ha;

nʼosisi fịa ka ụgbala na-ewu akwụ ya.

Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa;

nʼọgba dị na nkume ka ewi nkume na-ezo onwe ha.

I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche;

anyanwụ makwaara mgbe ọ ga-eji daa.

Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị;

ụmụ anụ ọhịa niile nke oke ọhịa na-akpagharị.

Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu,

ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha.

Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara,

ha na-alaghachi zoo onwe ha nʼebe nzuzo ha.

Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ,

kwụsịkwa nʼanyasị mgbe ọchịchịrị bidoro ịgba.

Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ.

Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha.

Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke.

Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara;

jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi,

anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta.

Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị,

nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu.

Ha niile na-adabere na gị,

ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru.

Ị na-enye ha nri;

ha na-erikwa ya.

Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri,

afọ na-eju ha nke ọma.

Mgbe i zonarịrị ha ihu gị,

egwu na-eju ha obi.

Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha,

ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta.

Mgbe i zipụrụ mmụọ gị,

a na-eke ha;

ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa.

Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi;

ka ọrụ aka Onyenwe anyị niile wetara ya ọṅụ,

onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji,

onye na-emetụ ugwu niile aka, ha na-akwụ anwụrụ ọkụ.

Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m;

aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ.

Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ,

dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.

Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa.

Ka ndị niile na-emebi iwu gharakwa ịdị ọzọ.

Too Onyenwe anyị gị mkpụrụobi m!

Toonu Onyenwe anyị!

Source notes (1)
  1. Footnote Ems 9:6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.