Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 102

Ekpere nke onye nọ na mmekpa ahụ na ọnọdụ ịda mba, na-ekwupụta otu o si dịrị ya nʼihu Onyenwe anyị.

Arịrịọ maka ime ebere

Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị;

ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị.

Ezonarịla m ihu gị

nʼụbọchị nsogbu m.

Gee ntị nʼekpere m,

zakwaa m ngwangwa.

Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ;

ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ.

Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa;

ana m echefu iri nri m.

Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ,

enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ.

Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara,

a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị.

Ana m amụ anya abalị niile;

adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ.

Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị;

ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ.

Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m,

anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m

nʼihi oke iwe gị,

i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ.

Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada.

Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa.

Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi;

aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ,

nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola;

oge ahụ a kara aka eruola.

Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị;

mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere.

Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị,

ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị.

Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn,

ọ ga-apụta ihe nʼebube ya.

Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa;

ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya.

Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu,

ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị:

“Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya,

o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa,

ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ

na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.”

Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn;

a ga-eto ya na Jerusalem,

mgbe mba niile na alaeze niile,

ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe.

O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m;

o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ.

Nʼihi ya, ekwuru m sị,

“Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ;

ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa,

eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.

Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide;

ha ga-erichasị dịka akwa ochie.

Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya,

ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga.

Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe,1

ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ.

Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide;

ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”

Source notes (1)
  1. Footnote Aịz 41:1; Aịz 43:10; Mal 3:6; Hib 13:8; Jem 1:17

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.