Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 101

Abụ Ọma Devid.

Nkwa eze

Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi;

o Onyenwe anyị, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto.

Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla,

olee mgbe ị ga-abịakwute m?

Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụla

jegharịa nʼime ụlọ m.

Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya

nʼihu m.

Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị.

Agaghị m enwekwa oke nʼime ya.

Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso.

Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla.

Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo,

onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ;

agaghị m anabata

onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga.

Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya,

ka mụ na ha biri;

onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụla

ga-ejere m ozi.

Onye ọbụla na-aghọ aghụghọ

agaghị ebi nʼụlọ m;

onye ọbụla na-ekwu okwu ụgha

agaghị eguzokwa nʼihu m.

Ụtụtụ niile ka m na-eme ka ha dere duu

bụ ndị ajọ omume niile nọ nʼala a;

Aga m ebipụ ndị niile na-eme ajọ ihe

site nʼobodo Onyenwe anyị.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.