Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 100
Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju.
Toonu Chineke
Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile.
Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe;
jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya
Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke.
Ọ bụ ya onwe ya kere anyị,1 ọ bụkwa ya nwe anyị,
anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ.
Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya
jiri otuto baa nʼogige ya;
keleenụ ya, tookwa aha ya.
Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.
Source notes (1)
- Footnote Job 10:3; Efe 2:10
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.