Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Ilu 16

Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime,

ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị.

Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya,

ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.

Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị,

ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.

Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya,

o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi.

Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị.

Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ.

Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie;

ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.

Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ,

ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo.

Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume

karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi.

Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị,

maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.

Egbugbere ọnụ eze na-ekwu okwu sitere na-ezi nghọta,

ọnụ ya adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.

Ihe ọtụtụ ziri ezi na ihe niile ha nʼotu dịrị Onyenwe anyị,

ihe niile e ji atụ ihe dị nʼime akpa bụ ya mere ha.

Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị,

nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike.

Ndị eze na-enwe mmasị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu eziokwu,

ha na-agụ onye na-ekwu eziokwu dị ka ezi mmadụ.

Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ.

Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ.

Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ,

ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo.1

Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe

karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.

Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ,

ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha.

Nganga na-eweta ịla nʼiyi,

mpako na-ewetakwa ọdịda.

Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga,

na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.

Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma,

onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.

A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere.

Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma.

Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya,

ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ.

Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya,

egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu.

Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ,

ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike.

Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ,

ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.

Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ;

agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu.

Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ,

egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ.

Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu;

ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi.

Ndị ọjọọ na-arafu ndị agbataobi ha,

na-edubakwa ha nʼụzọ ga-ewetara ha mbibi.

Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ,

onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie.

Isi awọ bụ okpueze nke mara mma,

a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.

Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya.

Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.

A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị,

maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.

Source notes (1)
  1. Footnote Mmiri ozuzo nʼoge ọkọchị na-eme ka ahịhịa kpọnwụrụ akpọnwụ tutee, nke a na-eweta ọnụ, nʼihi olileanya ọ na-enye banyere ụba nke ihe a kụrụ nʼubi.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.