Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Ilu 15
Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ;
ma okwu ike na-akpali iwe.
Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa,
ma ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu enweghị uche.
Onyenwe anyị na-ahụzu ihe niile,
anya ya dịkwa nʼahụ ndị ọma na ndị ọjọọ.
Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume;
ma nkwutọ na-eweta ịda mba.
Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu;
ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche.
Ụlọ ndị ezi omume na-ejupụta nʼọtụtụ akụ,
ma akụ ndị na-emebi iwu na-ewetara ha nsogbu.
Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma,
ma obi ndị nzuzu ezighị ezi.
Onyenwe anyị na-akpọ aja ndị ajọ omume asị,
ma ekpere ndị ndụ ha ziri ezi na-atọ ya ụtọ.
Onyenwe anyị kpọrọ ụzọ ndị na-emebi iwu asị,
ma ndị na-achụso ezi omume ka ọ na-ahụ nʼanya.
Oke ịdọ aka na ntị na-echere ndị na-ahapụ ụzọ.
Onye kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ ọnwụ.
Onyenwe anyị mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ;
ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ?
Ọ dịghị atọ onye na-akwa emo ụtọ ma a baara ya mba,
ya mere ọ dịghị ejekwuru onye maara ihe.
Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma.
Ihu gbarụrụ agbarụ na-egosi obi nwere ihe mwute.
Obi nwere nghọta na-achọ ịmata ihe,
ma ọnụ onye nzuzu na-azụ onwe ya nʼokwu na-abaghị uru.
Ndụ onye ogbenye jupụtara nnọọ na mgbalị,
ma ndị nwere udo nʼobi na-eri oriri mgbe niile.
Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị,
karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu.
Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya,
karịa ehi buru ibu a zụziri azụzi nke ịkpọ asị dị na ya.
Onye iwe ọkụ na-amalite ọgụ;
ma onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ na-eme ka ịlụ ọgụ kwụsị.
Eji ogwu gbochie ụzọ onye umengwụ,
ma ụzọ onye omume ya ziri ezi bụ ụzọ dị larịị.
Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ,
ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.
Onye na-enweghị uche na-aṅụrị ọṅụ nʼime amaghị ihe ya,
ma onye nwere nghọta na-aga ije nʼụzọ ziri ezi.
Nzube na-enweghị ndụmọdụ na-ama afọ nʼala,
ma ndị ndụmọdụ dịrị ọtụtụ ọganihu ga-adị.
Ọṅụ na-adị mgbe mmadụ natara ọsịsa dị mma,
okwu e kwuru nʼoge o kwesiri dị mma.
Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche,
iwezuga ha site na-ịgbada nʼala mmụọ dị nʼokpuru.
Onyenwe anyị na-adọtu ma na-adọrisi ụlọ nke onye mpako,
ma oke ala nke nwanyị di ya nwụrụ ka ọ na-elekọta.
Echiche ọjọọ niile nke ndị na-emebi iwu ka Onyenwe anyị kpọrọ asị
ma okwu ebere niile dị ọcha nʼanya ya.
Onye anya ukwu na-ewetara ezinaụlọ ya nsogbu.
Ma onye kpọrọ iri ngarị asị ga-adị ndụ.
Obi onye ezi omume na-atule ọsịsa ya
ma ọnụ nke onye ajọ omume na-asọpụta ihe ọjọọ dị iche iche.
Onyenwe anyị anọghị ndị na-emebi iwu nso;
ma ọ na-anụ ekpere ndị ezi omume.
Ihu ọchị na-eweta obi ụtọ.
Akụkọ ọma na-enyekwa ọkpụkpụ ndụ.
Onye na-ege ntị nye ịba mba nke na-enye ndụ
ga-esoro ndị amamihe nọrọ.
Onye jụrụ ịdọ aka na ntị kpọrọ onwe ya asị
ma onye ọbụla naara ndụmọdụ nwere nghọta.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị;
onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.