Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Ilu 14

Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya,

ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya.

Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị;

ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị.

Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako,

ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha.

Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha,

ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ.

Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ,

ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla.

Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya;

ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ.

Si nʼebe onye nzuzu wezuga onwe gị,

nʼihi na ị gaghị achọta ihe ọmụma nʼọnụ ya.

Amamihe nke onye nwere uche bụ ihe na-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga,

ma enweghị uche nke ndị nzuzu bụ aghụghọ.

Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo;

ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi.

Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya,

ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya.

A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi,

ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu.

Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ,

ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.

Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị,

ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ.

Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi aghaghị inweta ụgwọ ọrụ ha,

ma ezi mmadụ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya.

Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya;

ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje.

Onye mara ihe na-atụ egwu Onyenwe anyị na-ewezugakwa onwe ya nʼihe ọjọọ,

ma onye nzuzu na-ewebiga iwe oke ma na-eche na ọ ka bụ onye kwesiri ntụkwasị obi.

Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu,

ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị.

Ndị na-enweghị uche na-enweta ụgwọ ọrụ nke uche gbagọrọ agbagọ,

ma onye nwere uche na-enweta ihe ọmụma.

Ndị ọjọọ ga-akpọ isiala nʼihu ndị ezi mmadụ,

ndị ajọ omume ga-ada nʼọnụ ụzọ ama ndị ezi omume.

Ọ bụladị ndị agbataobi onye ogbenye na-akpọ ya asị,

ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi.

Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie,

ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma.

Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu?

Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.

Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru;

ma oke okwu na-eweta ụkpa.

Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha,

ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru.

Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ,

ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ.

Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba;

nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ.

Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ;

nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.

Otuto onye eze na-enwe dabeere nʼọnụọgụgụ ndị ọ na-achị,

e wezuga ndị ọ na-achị, eze enweghị ugwu ọbụla.

Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta,

ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya.

Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo;

ekworo na-eme ka o ree ure.

Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya,

ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke.

Ọ bụladị nʼọnwụ onye ezi omume nwere ebe mgbaba nʼime Chineke,

ma ndị ajọ omume na-ala nʼiyi, mgbe mbibi bịara.

Nʼobi onye nwere nghọta ka amamihe na-anọgide,

ma ọ bụladị nʼetiti ndị nzuzu ọ na-eme ka amara ya.

Ezi omume na-ewuli mba elu,

ma mmehie bụ ihe ihere nye ndị ọbụla.

Eze na-aṅụrị ọṅụ nʼihi odibo maara ihe;

ma odibo na-eweta ihere na-akpali oke iwe ya.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.