Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Ilu 13

Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya

ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba.

Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ,

ma ndị na-aghọgbu ibe ha ga-anata ihe ike dịka ụgwọ ọrụ ha.

Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka!1

Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.

Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta;

ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.

Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị,

ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu

na-ewetara ya ihere na nkọcha.

Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile,

ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi.

Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa.

Ma ọ dịkwa mmadụ na-eme ka ọ bụ onye ụkpa maọbụ ọgaranya.

Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya,

ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ.

Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ,

ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ.

Nganga na-eweta esemokwu,

ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ.

Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa;

ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto.

Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi,

mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị.

Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya,

ma onye na-atụ egwu ihe enyere nʼiwu ga-anata ụgwọ ọrụ ya.

Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ,

nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.

Ezi nghọta na-eweta ihuọma,

ma ụzọ nke ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eduba ha na mbibi.

Onye nwere uche na-eji ọmụma ihe nʼarụ ọrụ,

ma ndị nzuzu na-egosipụta enweghị uche ya.

Onyeozi ajọ omume na-adaba na nsogbu,

ma onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ọgwụgwọ.

Onye na-ajụ ịdọ aka na ntị ga-anwụ nʼụkpa na nʼihere;

ma onye na-anabata ịdọ aka na ntị ka a ga-asọpụrụ.

Mgbe ihe a na-ele anya mezuru ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ,

ma ndị nzuzu kpọrọ isite nʼajọ ihe wezuga onwe ha asị.

Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe,

nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.

Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie,

ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume.

Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ,

ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume.

Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri,

ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya.

Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya;

ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.

Onye ezi omume na-eri nri ruo na nriju afọ onwe ya,

ma nri na-akọ nʼafọ onye ajọ omume.

Source notes (1)
  1. Footnote Abụ 141:3; Ilu 21:23

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.