Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Ilu 17
Ọ ka mma ịta iberibe achịcha kpọrọ nkụ ma ịnọ nʼudo adị ya,
karịa nʼụlọ jupụtara nʼoke oriri na ịlụ ọgụ.
Ohu nwere uche ga-achị nwa nna ya ukwu na-eweta ihere
ma ketakwa oke nʼihe nketa dịka otu nʼime ndị ezinaụlọ ahụ.
Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo
ma Onyenwe anyị na-anwale obi.
Ajọ mmadụ na-aṅa ntị nʼegbugbere ọnụ na-eduhie,
onye ụgha na-aṅakwa ntị nye ire na-ekwu okwu ịla nʼiyi.
Onye ọbụla na-akwa ogbenye emo ọ bụ Chineke kere ha ka ọ na-elelị anya.
Ndị niile na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe ike dakwasịrị ha aghaghị ịta ahụhụ.
Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye.
Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.
Egbugbere ọnụ na-ekwu okwu dị mma abụghị nke onye nzuzu,
otu a kwa, egbugbere ọnụ na-agha ụgha ekwesighị ịbụ nke onye na-achị achị.
Nʼanya onye na-enye ngarị ọ na-ahụta ya dịka ọgwụ ịrata mmadụ,
ha na-eche nʼebe ọbụla ha chere ihu ihe ga-aga nke ọma.
Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie,
ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi.
Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara uru
karịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu.
Onye ọjọọ na-ebi naanị ndụ nnupu isi1 megide Chineke.
Ọ bụkwa onyeozi nke ọnwụ2 ka a ga-eziga imegide ya.
Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ ya
karịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ.
Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma,
ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị.
Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya,
nʼihi ya ekwela ka ọ malite.
Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe,
Onyenwe anyị na-akpọ omume abụọ a asị.
Uru gịnị ka ego bara nʼaka onye nzuzu;
ebe ọ bụ na o nweghị ike ịchọ amamihe.
Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla.
Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.
Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji,
si otu a ghọọ onye ji ụgwọ.
Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya.
Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku.
Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ.
Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu.
Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ
dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu.
Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike,
ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa.
Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị3 na nzuzo
ka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi.
Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme,
ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa.
Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute,
bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu.
Ọ bụrụ na ịra onye ezi omume nra adịghị mma,
nʼezie, ịpịa ndị ọrụ ihe nʼihi ezi ọrụ ha ezighị ezi.
Nwoke ahụ na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu bụ onye maara ihe,
onye mmụọ ya dịkwa jụụ bụ onye nwere nghọta.
A ga-agụ onye nzuzu nʼonye maara ihe ma ọ bụrụ na ha gba nkịtị,
gụọkwa ha na ndị nwere nghọta ma ọ bụrụ na ha e jide ire ha.
Source notes (3)
- Footnote Ya bụ, omume megidere iwu ya
- Footnote Ya bụ, onyeozi na-adịghị eme obi ebere.
- Footnote Ọpụ 23:8
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.