Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Ilu 11
Ihe ọtụtụ aghụghọ1 bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị
ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ.
Nganga bịa, nlelị a na-eso ya,
ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe.
Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha;
ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi.
Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe;
ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.
Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi,
ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha.
Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya;
ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha.
Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi,
ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi.
Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha,
ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya.
Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya.
Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya.
Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ,
otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ.
A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu,
ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume.
Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu;
ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.
Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo,
ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.
Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada,
ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.
Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ,
ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.2
Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma,
ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.
Onye nwere obiọma baara onwe ya uru,
ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu.
Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ,
ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi.
Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ;
ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ.
Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị
ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.
Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ,
ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta.
Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche,
dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi.
Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ,
ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ.
Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa,
ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye.
E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya;
onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa.
Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ,
ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke.
Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma,
ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya.
Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada,
ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ.
Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe,
onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe.
Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ,
onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe.
Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a;
a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ.
Source notes (2)
- Footnote Lev 19:35-36; Dit 25:13-16; Mai 6:11
- Footnote Maọbụ, ga-enwe udo
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.