Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Ilu 10

Ndị a bụ ilu Solomọn

Ilu dị iche iche nke Solomọn:

Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ;

ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ.

Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru,

ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ.

Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ,

ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma.

Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye,

ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba.

Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe,

ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere.

Onye ezi omume na-anata ngọzị,

ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.

Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị,

ma aha onye ajọ omume ga-ere ure.

Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu,

ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi.

Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu,

ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta.

Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute,

onye nzuzu ekwurekwu ga-abịa nʼịla nʼiyi.

Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ,

ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.

Ịkpọ asị na-akpali esemokwu,

ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile.

Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi,

ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu.

Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma,

ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku.

Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,

ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye.

Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ,

ma ihe nweta nke onye ajọ omume bụ mmehie na ọnwụ.

Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ,

ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo.

Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asị

na onye na-agbasa okwu nkwutọ bụ onye nzuzu.

Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị

ma ndị nwere uche na-ejide ire ha.

Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma,

ma obi onye ajọ omume bụ ihe ọnụahịa nta.

Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ,

ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha.

Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya,

ọ naghị atụkwasị ya nsogbu.

Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ;

ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta.

Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya,

ihe onye ezi omume na-achọ ka a ga-enye ya.

Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu;

ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi.

Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya;

ọ dịka anwụrụ ọkụ nʼanya mmadụ maọbụ dịka mmanya gbara ụka nke na-ejiji eze.

Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-enye ogologo ndụ,

ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ.

Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ;

olileanya ndị na-emebi iwu bụ naanị ihe efu.

Ụzọ Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta,

maọbụ ịla nʼiyi nye ndị na-eme ajọ ihe.

A pụghị iwezuga1 onye ezi omume,

ma onye na-emebi iwu agaghị anọgide.

Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa,

ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu.

Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma,

ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie.

Source notes (1)
  1. Footnote Maọbụ, ihopu

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.