Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Ilu 9
Ọkpụkpọ oku nke amamihe na nzuzu
Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya
nʼelu ogidi asaa.
O doziela oriri ya nʼusoro,
o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya.1
O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile,
site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị,
“Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche”
Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị,
“Bịanụ, rie nri m,
ṅụọkwa mmanya m gwakọtara.
Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ;
gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.”
Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị;
onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha.
Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị;
baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya.
Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa,
kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya.
Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe,
inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.
Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo.
A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị.
Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru,
ma ị bụrụ onye na-akwa emo, naanị gị ga-ata ahụhụ ya.
Nwanyị dị nzuzu na-eme mkpọtụ,
o nweghị uche; ihere adịghịkwa eme ya.
Ọ na-anọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ya,
nʼelu oche nʼebe dịkarịsịrị elu nʼobodo,
na-akpọ ndị na-aga nʼụzọ oku,
bụ ndị na-aga mkpa ha,
“Ka ndị niile amamihe kọrọ bịa nʼụlọ m.”
Ọ na-asịkwa ndị na-enweghị uche,
“Mmiri e zutere nʼohi na-atọ ụtọ,
nri e riri na nzuzo na-atọkarịkwa nʼụtọ.”
Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ,
na ndị ọ kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ.
Source notes (1)
- Footnote A na-eji ụda máá gwakọọ na mmanya i ji mee ka ọtọ ezi ụtọ nʼọnụ.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.