Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 9

Okwu Job

Job zara sị:

“Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu.

Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke?

Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ,

ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya?

Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara,

onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ?

Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a,

na-akwatụ ha nʼiwe ya.

Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya,

mee ka ogidi ya maa jijiji.

Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha;

ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye.

Naanị ya gbasara mbara eluigwe,

ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri.

Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion

na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe.

Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta,

ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta.

Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya,

mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya.

Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya?

Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’

Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi,

ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya.

“Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ,

maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka?

Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu;

kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere.

A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m,

ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị.

Ọ ga-eji oke ifufe tirie m,

meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya.

Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi

kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m.

Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu!

Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya.

A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe;

ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara.

“Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị

ejighị m onwe m kpọrọ ihe;

nʼezie ana m eleda ndụ m anya.

Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị,

‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’

Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede,

ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị.

Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu,

ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya.

Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya?

“Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ;

ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya.

Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs,1

dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri.

Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m,

aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’

Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu

nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha.

Ebe m bụrịị onye ikpe mara,

nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu?

A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m

werekwa soda saa aka m abụọ,

ị ga-enuba m nʼolulu apịtị

nke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị.

“Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya,

ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe.

A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị,

onye ga-ebikwasị anyị abụọ aka ya,

onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ,

ka oke egwu ya gharakwa ịtụ m ọzọ.

Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu;

ma ka ọ dị ugbu a ọ dịghị ihe m nwere ike ime.

Source notes (1)
  1. Footnote Ọ bụ nʼIjipt ka a na-eji ahịhịa papịrọs arụ ụgbọ epeepe. Ọpụ 2:3

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.