Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Job 10
“Ike ịdị ndụ agwụla m.
Hapụnụ m ka m kwuo ihe dị m nʼobi,
kwupụta ya dịka obi ilu nke mkpụrụobi m si dị.
Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe,
kama gwa m ihe mere i ji ama m ikpe.
Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m,
si otu a leda ọrụ aka gị anya,
mgbe ị na-anabata atụmatụ nke ndị na-emebi iwu?
Ị nwere anya nke anụ ahụ?
Ị na-ahụ ụzọ dịka mmadụ si ahụ?
Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ,
ka afọ nke gị, ha dịka nke mmadụ dị ike?
Nke ga-eme na i na-achọpụta ikpe ọmụma m
ma nyochaa mmehie m?
Ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m,
na ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m site nʼaka gị.
“Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m.1
Ọ ga-atụgharịa ugbu a bibie m?
Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ.
Ị ga-eme ka m laghachi nʼaja ọzọ?
Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehi
mee ka m kpụkọta dịka mmiri ara rahụrụ arahụ?
Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ,
werekwa ọkpụkpụ na akwara kpaa m dịka uwe?
I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị,
nʼịdị mma gị chebekwara mmụọ m.
“Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị,
amakwa m na ọ bụ ihe dị gị nʼuche.
Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya,
ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m.
Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m!
A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elu
nʼihi na ejupụtara m nʼihere,
bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m.
Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ
ma werekwa ike gị dị egwu megide m.
I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m,
mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ;
ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri.
“Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m?
Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m.
A sịkwarị na amụpụtaghị m
maọbụ na e sitere nʼafọ nne m buba m nʼime ili!
Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole?
Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị ka m nwetu ọṅụ nwa mgbe nta,
tupu m hapụ laa nʼala ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụ
ebe m na-agaghị esi pụtakwa.
Nʼala nke oke ọchịchịrị,
ala nke onyinyo ọnwụ, nke usoro na-adịghị,
ebe ọbụladị ìhè dịkwa ka ọchịchịrị.”
Source notes (1)
- Footnote Abụ 119:73; 139:13
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.