Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 11

Okwu Zofa

Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:

“Ọ dịghị nzaghachi dịịrị ọtụtụ okwu niile ndị a?

A ga-agụ onye ekwurekwu a dịka onye ikpe na-amaghị?

Okwu efu gị ndị a ha ga-eme ka mmadụ gba nkịtị?

Ọ bụ na ọ dịghị onye ga-abara gị mba mgbe ị na-akwa emo?

Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ,

adịkwa m ọcha nʼanya gị.’

Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a si na Chineke ga-ekwu okwu,

na ọ ga-asaghe egbugbere ọnụ ya imegide gị.

Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe,

nʼihi na ezi amamihe nwere akụkụ abụọ.

Mara nke a: Chineke echefuola ụfọdụ mmehie gị.

“I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke?

I nwere ike ịnwapụta nsọtụ nke Onye pụrụ ime ihe niile?

Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime?

Ha dị ogbu karịa ala ili, gịnị ka ị pụrụ ịma?

Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa,

dị obosara karịa oke osimiri.

“Ọ bụrụ na ọ bịa tụba gị nʼime ụlọ mkpọrọ,

kpọkọta ndị ikpe, onye ga-egbochi ya?

Nʼezie, ya onwe ya na-amata ndị nduhie,

mgbe ọ hụrụ ajọ ihe, ọ bụ na ọ dịghị amatakwa ya?

Onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihe

naanị mgbe nwa ịnyịnya ibu ọhịa mụrụ ghọrọ mmadụ.

“Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya,

setịpụ aka gị abụọ nye ya,

ọ bụrụ na i wezuga mmehie nke dị gị nʼaka,

ghara ikwe ka ihe ọjọọ dịrị nʼụlọ ikwu gị

mgbe ahụ, ihere agaghị eme gị iwelite ihu gị,

ị ga-eguzokwa chịm na-atụghị egwu.

Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị,

na-echeta ya dịka mmiri gabigara agabiga.

Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie,

ọchịchịrị ya ga-adịkwa ka ụtụtụ.

Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị;

ị ga-elegharịkwa anya gburugburu gị zuo ike na-atụghị ụjọ.

Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla,

ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ ịnata amara nʼihu gị.

Ma anya ndị na-emebi iwu ga-ada,

ha agaghị achọta ụzọ mgbapụ;

olileanya ha ga-abụ nkubi ume nke ọnwụ.”

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.