Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 12

Okwu Job

Mgbe ahụ, Job zara:

“Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe,

unu na amamihe ga-anwụkọ nʼotu.

Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu;

abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ.

Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu?

“Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ,

nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za,

onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị!

Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya

dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ.

Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ;

ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo,

bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha.

“Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị,

maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị.

Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị,

maọbụ kwere ka azụ nọ na mmiri kọọrọ gị.

Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghị

na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a?

Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị,

ya na ndụ ụmụ mmadụ

Ọ bụ na ntị adịghị anwale okwu,

otu ire si anwale ihe oriri?

Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye?

Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta?

“Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike,

ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya.

Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ;

mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ.

Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa.

Ọ bụrụ na o zipụ ha, ha erikpuo ala niile.

Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị;

ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.

Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha,

ma ndị ikpe ka ọ na-eme ka ha ghọọ ndị nzuzu.

Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere,

ma were akwa mgbochi kee ha nʼukwu.1

Ọ na-agbawa ndị nchụaja ọtọ chụpụ ha,

kwatuokwa ndị ọnọdụ ha sirila ike ogologo oge gara aga.

Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi,

wepụkwa nghọta nke ndị okenye.

Ọ na-eji ndị ọgaranya eme ihe ọchị,

napụkwa ngwa agha nke ndị dị ike.

Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrị

meekwa ka oke ọchịchịrị pụta ìhè.

Ọ na-eme ka mba dị ukwuu, ọ na-emekwa ka ha laa nʼiyi;

Ọ na-eme ka mba baa ụba, ma chụsakwaa ha.

Ọ na-anapụ ndị ndu nke ụwa amamihe ha,

zipụkwa ha ka ha na-awagharị nʼọzara ebe ụzọ na-adịghị.

Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè.

Ọ na-eme ha ka ha na-adagharị dịka ndị mmanya na-egbu.

Source notes (1)
  1. Footnote Ndị ohu a dọtara nʼagha bụ naanị akwa mgbochi a na-eke nʼukwu ka ha na-eyi.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.