Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 13

“Anya m abụọ ahụla ihe ndị a niile,

ntị m anụla ma ghọtakwa ha.

Mụ onwe m makwa ihe unu maara;

abụghị m onye dị ala nʼebe unu nọ.

Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu,

ka mụ na Chineke rụọkwa ụka banyere okwu m.

Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ;

unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru.

Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị,

nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe.

Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m;

geekwanụ ntị nụrụ okwu si m nʼọnụ na-apụta.

Unu ga-ekpelara Chineke ikpe mmegide?

Unu ga-esite nʼokwu aghụghọ kwuchitere Chineke ọnụ ya?

Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe?

Unu ga-ekwuchite ọnụ Chineke?

Ọ ga-adịrị unu mma ma ọ bụrụ na o nyochaa unu?

Unu pụrụ ịghọgbu ya dịka unu si aghọgbu ndị mmadụ?

Ọ ghaghị ịbara unu mba

ma ọ bụrụ na unu ejiri okwu ụgha chọọ inyere ya aka.

Ọ ga-abụ na ebube na ịdị ukwuu ya adịghị eme ka unu maa jijiji?

Egwu ya ọ dịghị atụ unu?

Okwu amamihe unu niile dịka ilu nke ntụ;

okwu ngọpụ unu dịka ihe ngọpụ ụrọ.

“Nọọnụ jụụ ka m kwuo okwu;

ihe ọ pụtara ya pụta.

Nʼihi gịnị ka m ga-eji tinye onwe m na nsogbu,

werekwa ndụ m tinye nʼọbụaka m?

A sịkwarị na ọ ga-etigbu m aghaghị m ịtụkwasị ya obi m.

Aga m ekwuchite ọnụ m gwa ya na ụzọ m dị ọcha.

Nʼezie, nke a ga-aghọrọ m nzọpụta

maka na ọ dịghị onye ajọ omume ọbụla pụrụ ịbịa nʼihu ya.

Geenụ ntị nke ọma nʼokwu m.

Kwerenụ ka ihe m na-ekwu baa unu ntị.

Ugbu a, edoziela m ikpe m nʼusoro,

amatala m na ikpe agaghị ama m.

Ọ dị onye pụrụ ibo m ebubo1?

Ọ bụrụ na o nwere, aga m emechi ọnụ m ma nwụọ.

“Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke,

mgbe ahụ agaghị m ezo onwe m nʼihu gị.

Wepụ aka gị i ji emegide m, meekwa ka ha dị anya nʼebe m nọ.

Kwụsị ime ka oke egwu gị mee ka m maa jijiji.

Mgbe ahụ, kpọọ m oku, aga m azakwa gị.

Maọbụ, kwerekwa ka m kwuo okwu, ka ị zaa m.

Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere?

Gosi m ajọ omume m na mmehie m.

Gịnị mere i ji gbakụta m azụ?2

Gịnị mere i ji gụọ m dịka onye iro gị?

Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ?

Ị ga-achụ ahịhịa kpọrọ nkụ ọsọ?

Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m,

na-emekwa ka m ghọrọ mkpụrụ mmehie m mere nʼoge okorobịa m.

Ị na-eji mkpọrọ igwe kegide ụkwụ m abụọ;

na-enyochakwa nzọ ụkwụ m niile

site nʼitinye akara nʼebe ọbụla ọbụ ụkwụ m zọrọ.

“Ya mere, mmadụ nʼala nʼiyi dịka ihe rere ere,

na dịka akwa nke nla riri.

Source notes (2)
  1. Footnote Aịz 50:8
  2. Footnote Abụ 13:1

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.