Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 8

Okwu Bildad

Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zaghachiri sị:

“Ruo ole mgbe ka i ga na-ekwu okwu dị otu a?

Okwu ọnụ gị bụ naanị ifufe dị ike.

Chineke ọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?

Onye pụrụ ime ihe niile ọ na-eme ka ihe ziri ezi gbagọọ agbagọ?

Mgbe ụmụ gị mehiere megide ya,

o weere ha nyefee nʼikpe ọmụma kwesiri mmehie ha.

Ma ọ bụrụ na i ga-achọsi Chineke ike,

rịọ Onye pụrụ ime ihe niile,

ọ bụrụ na ị bụ onye dị ọcha nʼobi na onye ụzọ ya ziri ezi,

ọ bụladị ugbu a, ọ ga-agbachitere gị

weghachi gị nʼọnọdụ ịbụ ọgaranya gị.

Ọ bụ ezie, na mmalite gị nwere ike ịdị ala,

ma ụbọchị ikpeazụ gị ga-adị elu.

“Jụọ ọgbọ ndị gara aga

ma chọpụta ihe ndị bụ nna ha chọpụtara.

Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ndị a mụrụ naanị ụnyaahụ, ndị ọ dịghị ihe ha maara.

Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dịka onyinyo.

Ọ bụ na ha agaghị agwa gị ma kuziekwara gị ihe?

Ọ bụ na ha agaghị esite na nghọta kwuo okwu?

Ahịhịa papịrọs o nwere ike ito nʼebe apịtị na-adịghị?

Ahịhịa riidi ọ ga-eto nʼebe mmiri na-adịghị?

Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha,

ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ.

Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke,

otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi.

Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa;

ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide.

Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi;

ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa.

Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị,

nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ.

Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ,

ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a.

Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya,

ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’

Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ,

site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa.

“Nʼezie Chineke anaghị agbakụta onye ụzọ ya ziri ezi azụ,

maọbụ gbaa aka onye ajọ omume ume.

Ọ ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị.

Ọ ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta.

Ndị iro gị ka a ga-eyikwasị ihere dị ka uwe,

ebe obibi nke ndị na-emebi iwu agaghị adịkwa.”

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.