Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Job 7
“Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba?
Ụbọchị ya ọ dịghị ka ụbọchị onye e goro ọrụ?
Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada,
maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya,
otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya,
nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya.
Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’
Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ.
Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ;
anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya.
“Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa,
ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla.
O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume;
anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ.
Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ;
unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ.
Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa,
otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa.
E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ;
ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ.
“Ya mere agaghị m emechi ọnụ;
aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ.
Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi.
A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri,
nke mere i ji eche m nche?
Mgbe m chere na ihe ndina m ga-akasị m obi,
maọbụ na oche izuike m ga-ewepụ ntamu m,
nʼagbanyeghị na ị na-eji nrọ menye m egwu
werekwa ịhụ ọhụ mee ka m maa jijiji,
ya mere, ahọrọ m ị bụ onye a tọgburu atọgbu na ọnwụ,
karịa inwe ụdị ahụ m nke a.
Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi.
Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi.
“Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe,
i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya,
i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile,
ma na-anwale ya mgbe mgbe?
Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ,
maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri?
Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị,
gị onye na-ahụ ihe niile anyị na-eme?
Gịnị mere i ji elekwasị m anya?
Abụrụla m ibu arọ nye gị?
Ọ bụ na i nweghị ike ịgbaghara m njehie m,
ma bupụ mmehie m?
Nʼihi na oge ọnwụ m eruola nso, e, oge a ga-eliba m nʼaja, ma m nwụọ.
Mgbe ahụ ị ga-achọ m, ma ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ, nʼihi na agaghị m adịkwa.”
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.