Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 6

Okwu Job

Mgbe ahụ, Job zara sị:

“A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu m

ya na nhụju anya m niile nʼelu nʼihe ọtụtụ!

Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri,

nke mere okwu m ji ada ike ike.

Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m;

mmụọ m na-aṅụkwa nsi dị na ha;

ihe egwu Chineke edoola onwe ha nʼusoro imegide m.

Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata,

ka oke ehi ọ na-akwa akwa mgbe ihe oriri ya dị?

A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu,

ka o nwere ụtọ dị na eso ọkwụrụ?

A jụrụ m ịmetụ ya aka,

nʼihi na nri dị otu a na-eme ka m daa ọrịa.

“O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ,

na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya.

Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m

ka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m.

Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a,

wụlikwaa elu1 nʼime ihe mgbu na-adịgide,

na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ.

“Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ?

Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi?

Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume?

Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz?

Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka,

ugbu a, e siterela nʼebe m nọ wezuga nzube?

“Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ

na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.

Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha,

dịka iyi mmiri na-akọ, dịka iyi nke na-etofe ọnụ ya,

nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi,

nke unyi jupụtara nʼihi mgbaze nke mkpụrụ mmiri oyi.

Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị,

nke na-ata ata nʼihi okpomọkụ.

Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha.

Ha na-arịgo nʼala akọrọ si otu a laa nʼiyi.

Ndị ije si Tema na-ele anya mmiri,

otu a kwa ndị ahịa Sheba na-ele anya nʼolileanya.

Obi mgbu na-ejide ha nʼihi na ha nwere ntụkwasị obi,

ha bịarutere ebe ahụ, bụrụ ndị emenyere ihere.

Ma ugbu a, unu egosila na unu abaghị uru,

unu ahụla ihe na-eyi egwu ma ụjọ ejidela unu.

O nweela mgbe m sịrị unu, ‘Nyenụ ihe ọbụla nʼọnọdụ m,

sitenụ nʼakụnụba unu kwụọ ụgwọ ịgbapụta m,

gbapụtanụ m nʼaka ndị iro,

maọbụ napụtanụ m nʼaka ndị na-enweghị obi ebere’?

“Zienụ m ihe ga-eme ka m mechie ọnụ,

gosi m ebe m si mejọọ.

Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi!

Ma gịnị ka ịrụ ụka unu na-ewepụta?

Ị chọrọ idozi okwu ọnụ m?

Si otu a mee ka okwu onye ike gwụrụ ghọọ ikuku efu?

Unu nwere ike ife nza nʼisi onye na-enweghị nna,

ma refukwaa enyi unu.

“Lezie m anya nke ọma,

ọ dị unu ka m nwere ike ilegide unu anya gwa unu okwu ụgha?

Kwụsịnụ ihe unu na-eme. Unu abụla ndị na-eme ihe na-ezighị ezi,

tuleenụ ihe unu na-eme, nʼihi na ezi omume m ka guzosiri ike.

Ọ dị ihe ọjọọ si nʼegbugbere ọnụ m abụọ pụta?

Ọ bụ na ọnụ m apụghị ịchọpụta nzube iro?

Source notes (1)
  1. Footnote Maọbụ, nwekwa ọṅụ

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.