Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Job 36
Elihu gara nʼihu sị:
“Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gị
na ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke.
Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya;
aga m enye Onye kere m ezi omume.
Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha;
onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị.
“Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya;
ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime.
Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ,
kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha.
Ọ dịghị ewepụ anya ya1 nʼebe ndị ezi omume nọ,
kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze,
bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.
Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe,
jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike,
ọ na-agwa ha ihe ha mere,
na ha sitere na nganga ha mehie.
Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka,
na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme.
Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi,
ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba,
biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju.
Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị,
ha ga-ala nʼiyi site na mma agha,
ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe.
“Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha.
Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ.2
Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha,
nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche.
Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha;
na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha.
“Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu,
baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị,
baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ.
Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị;
ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị.
Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị;
ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị.
Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gị
ka ị ghara ịnọ na mkpagbu?
Anọla na-echere ka abalị bịa,
mgbe a na-adọkpụrụ ndị ụmụ mmadụ site nʼụlọ ha pụọ.
Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe,
bụ nke ọ dị ka ị na-ahọrọ karịa mkpagbu.
“E buliela Chineke elu nʼike ya,
onye bụ onye ozizi dịka ya?
Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso,
maọbụ sị ya ‘I meela ajọ ihe’?
Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu,
bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ.
Mmadụ niile ahụzuola ya;
ụmụ mmadụ nọ nʼebe dị anya na-ele ya anya.
Lee, Chineke dị ukwuu, karịa nghọta anyị.
Ọnụọgụgụ afọ ya karịrị mmadụ ịchọpụta.
“Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha,
nke a na-aghọ mmiri ozuzo nye iyi niile.
Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime ya
mee ka mmiri ozuzo dị ukwuu zokwasị ụmụ mmadụ.
Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii,
ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya?
Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu ya
na-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.
Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile
na-enyejukwa ha nri afọ.
O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya,
ma na-enye ya iwu itida ihe ọbụla ọ chọrọ.
Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri;
ọ bụladị ehi na-eme ka a mara na ọ nọ nso.
Source notes (2)
- Footnote Maọbụ, ịgbakụta azụ
- Footnote Ọ tara ha ahụhụ
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.