Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 37

“Nʼihi nke a, obi m na-ama jijiji,

na-amali elu site nʼọnọdụ ya.

Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya,

na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta.

Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile,

ọ na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ.

Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya;

ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe,

mgbe olu ahụ dara dakwasị,

ọ naghị egbochi amụma igbu egbu.

Nʼụzọ dị ebube ka olu Chineke si ada dịka egbe eluigwe;

ọ na-eme ọtụtụ ihe ukwuu nke anyị na-apụghị ịghọta.

Nʼihi na ọ bụ ya na-agwa snoo okwu sị: ‘Daa nʼelu ala,’

na-agwakwa mmiri ozuzo okwu sị, ‘Zoo nnukwu mmiri ozuzo.’1

Ka mmadụ o kere mata akaọrụ ya;

ọ na-emekwa ka mmadụ ọbụla kwụsị ịdọgbu onwe ya nʼọrụ.

Ụmụ anụmanụ bi nʼọhịa na-agbaba zoo onwe;

ha na-anọgide nʼebe obibi ha.

Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa,

oyi na-esitekwa nʼikuku na-agbasa agbasa.

Iku ume Chineke na-emepụta mkpụrụ mmiri,

ogbu mmiri na-akpụkọtakwa.

Ọ na-eme ka igwe ojii jupụta na mmiri;

na-eme ka amụma gbuo nʼime igwe ojii.

Site na ntụziaka ya ka ha na-echigharị onwe ha gburugburu

imezu ihe ọbụla ọ chọrọ ka ha mee

nʼelu ụwa niile.

Ọ na-ewebata igwe ojii maka ịta ndị mmadụ ahụhụ,

na-eweta ya maka ime ka mmiri zokwasị elu ala igosi ịhụnanya ya.

“Job, gee ntị.

Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ.

Ị maara otu Chineke si achịkọta igwe ojii

na-eme ka amụma gbuo?

Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe,

nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke?

Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụ

mgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịda na-abịa,

ị pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwe

nke dị ike dịka enyo bronz a wụrụ awụ?

“Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya;

ebe ọ bụ na anyị apụghị ido okwu anyị nʼusoro nʼihi ọchịchịrị nke anyị nọ nʼime ya.

A ga-agwa ya na m nwere okwu?

Ọ dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya?

Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya

ka ọ na-achake na mbara igwe,

mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha.

Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta;2

Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa.

Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye anyị na-enweghị ike chọta. Ike ya dị ukwuu,

nʼikpe ikpe ya ziri ezi na ezi omume ya bara ụba, ọ naghị emegbu mmadụ.

Ya mere, ụmụ mmadụ na-atụ egwu ya,

ọ bụ na o nweghị nsọpụrụ nye ndị niile obi ha maara ihe?”3

Source notes (3)
  1. Footnote Ghọọ oke mmiri ozuzo
  2. Footnote Maọbụ, nʼugwu ka ọ si na-abịa ka ebube ọlaedo
  3. Footnote Ma ọ dịghị agụnye ndị niile na-eche na ha maara ihe.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.