Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Job 35
Mgbe ahụ, Elihu sịrị:
“Ị na-eche na nke a ziri ezi?
Ị sịrị, ‘Na m ziri ezi ọ bụghị Chineke.’
Nʼagbanyeghị ihe ndị a, ị na-ajụ ya si, ‘Uru gịnị ka ọ baara m,
gịnị bụ uru m ma ọ bụrụ na emehieghị m?’
“Ọ ga-amasị m ịzaghachi gị,
zaghachikwa ndị enyi gị na ha nọ.
Lelie anya na eluigwe ma hụkwa.
Legide mbara igwe na igwe oji niile, nke dị anya karịa gị.
Ọ bụrụ na i mehie, olee ụzọ nke a si metụta ya?
Ọ bụrụ na mmehie gị bara ụba, gịnị ka nke a pụrụ ime ya?
Ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, gịnị ka ị na-enye ya,
maọbụ gịnị ka ọ na-anata site nʼaka gị?
Ajọ omume gị na-emetụta naanị mmadụ dịka gị,
ma ezi omume gị na-emetụta naanị ụmụ ndị mmadụ.
“Ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa nʼihi ịba ụba nke mmegbu,
ha na-arịọ arịrịọ enyemaka site nʼaka ndị dị ike.
Ma ọ dịghị onye na-asị, ‘Olee ebe Chineke onye kere m nọ,
onye na-enye abụ nʼime abalị,
onye na-akụziri anyị ihe karịa ka ọ na-akụziri ụmụ anụ ọhịa nke ụwa,
onye na-eme ka anyị bụrụ ndị maara ihe karịa ụmụ nnụnụ1 nke igwe?’
Ọ dịghị azaghachi mgbe ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa,
nʼihi ịnya isi nke ndị ajọ omume.
Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha;
Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya.
Ma ya bụrụzie nke a ị na-ekwu, ọ ga-esi aṅaa gee ntị
mgbe ị na-ekwu na ị dịghị ahụ ya anya,
na i burula ikpe gị bịa nʼihu ya
na ị ga-anọkwa na-eche ya!
Ọzọ, nʼihi na iwe ya adịghị eweta ntaramahụhụ,
nʼihi na ọ dịghị arịba ama ajọ omume ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta.
Ya mere, Job saghere ọnụ ya kwuo okwu dịka onye na-amaghị ihe;
ka onye na-enweghị uche ọ na-ekwu okwu nkwukwasị efu.”
Source notes (1)
- Footnote Maọbụ, anụ ufe
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.