Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 28

Nwa mgbe nta: Ebe a na-achọta amamihe

Olulu e si egwupụta ọlaọcha dị;

ebe a na-anụcha ọlaedo dịkwa.

E si nʼime ala ewepụta igwe,

ọlanchara na-agbazepụta site nkume na-aghọ ọla.

Mmadụ na-eme ka ọchịchịrị nwee ọgwụgwụ;

ọ na-enyochapụta ihe dị ebe dị anya,

na-achọ igwe nʼime oke ọchịchịrị.

Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi,

nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru,

nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị.1

Ala ahụ e si na ya enweta nri,

abụrụla ihe e ji ọkụ gbanwee nʼokpuru ya.

Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya;

aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo.

Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo;

anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya.

Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya,

ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ.

Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ

mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè.

Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ,

anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile.

Ha na-achọpụta isi mmiri niile

ma meekwa ka ihe nzuzo pụta ìhè.

Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe?

Olee kwa ebe nghọta bi?

Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya,

agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.

Ogbu mmiri na-asị, “Ọ dịghị nʼime m,”

osimiri na-asị, “Ọ dịghị nʼaka m.”

A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya,

apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha.

A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya,

a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,

A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya,

maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya.

Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị;

ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.

A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya;

a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya.

Olee ebe amamihe si abịa?

Olee ebe nghọta bi?

E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ,

e kpuchikwara ya nye ọ bụladị anụ ufe nke eluigwe.

Mbibi na ọnwụ na-asị;

“Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị.”

Chineke ghọtara ụzọ ya,

naanị ya makwara ebe obibi ya dị.

Nʼihi na ọ na-ahụ nsọtụ nke ụwa,

na-ahụkwa ihe niile dị nʼokpuru eluigwe.

Mgbe o hiwere ike nke ikuku,

tụọkwa mmiri nʼihe ọtụtụ,

mgbe o nyere mmiri ozuzo iwu

meekwa ụzọ nye egbe eluigwe na oke ikuku,

mgbe ahụ, o lere amamihe anya, nyochasịa ya,

meekwa ka o guzosie ike, ma nwapụtakwa ya.

Ọ sịrị mmadụ,

“Ịtụ egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe;

ọzọ, ị sị nʼihe ọjọọ wezuga onwe bụ nghọta.”

Source notes (1)
  1. Footnote Nʼoge ochie, ọ bụ nʼoche e ji eriri kegide ka ndị na-egwupụta ihe dị iche iche site nʼime ala na-anọdụ ala. Mgbe a na-adọtu ha, ụkwụ ha adịghị eru ala, ha na-akwụfegharịkwa nʼihi ọnọdụ ha.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.