Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 29

Ngọpụ ikpeazụ Job

Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:

“Ọ gaara adị m nọọ mma ma a sị na m ga-adị dịka m dị nʼọnwa ole na ole gara aga,

dịka ụbọchị ndị ahụ mgbe Chineke na-elekọta m,

mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi

ìhè ya ka m ji jee ije nʼọchịchịrị.

Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma,

mgbe mmekọrịta mụ na Chineke mere ka ụlọ m bụrụ ebe a gọziri agọzi,

mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m

na mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu,

mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ,

mgbe nkume na-awụpụtara m mmanụ oliv dịka mmiri na-asọ asọ.

“Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo

were ọnọdụ m nʼama.

Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha,

ndị okenye na-ahụkwa m ma guzo nʼụkwụ ha;

ndịisi ọchịchị obodo na-akwụsị ikwu okwu

ma were aka ha kpuchie ọnụ ha;

olu ndị a na-asọpụrụ na-adakwa jụụ,

ire ha na-araparakwa ha nʼakpo ọnụ.

Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m,

ndị hụkwara m na-agba ama ọma maka m.

Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka,

napụtakwa ndị mgbei na-enweghị ndị enyemaka.

Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m;

emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ.

Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe,

ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m.

Abụ m anya nye onye ìsì,

bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ.

Abụ m nna nke onye nọ na mkpa;

bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi.

Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume,

si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu.

“Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m,

na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala.

Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri,

na igirigi ga-adakwasịkwa nʼalaka m abalị niile.

Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m,

ụta m ga-adịgidekwa ọhụrụ nʼaka m.’

“Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị,

ha na-ederekwa duu ịnụrụ ndụmọdụ m.

Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ.

Okwu m na-ada juu na ntị ha.

Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo,

na-aṅụkwa okwu m dịka ala si aṅụ mmiri ozuzo nʼọkọchị.

Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya;

ìhè nke ihu m dị oke mkpa nye ha.

Ọ bụ m na-ahọpụtara ha ụzọ, na-anọdụ dịka onyeisi ha;

ebiri m dịka a ga-asị na m bụ onye eze nʼetiti ndị agha ya;

na dịka onye na-akasị ndị na-eru ụjụ obi.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.