Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Job 27
Okwu ikpeazụ Job nye ndị enyi ya
Ma Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:
“Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi,
Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi.
Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m,
mgbe iku ume Chineke dịkwa nʼimi m,
egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ,
ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ.
Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi;
ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m.
Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya;
o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m.
“Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume,
ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu.
Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya,
mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya?
Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya
mgbe nsogbu dakwasịrị ya?
Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile?
Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile?
“Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke;
agaghị m ezo ihe banyere ụzọ Onye pụrụ ime ihe niile.
Unu onwe unu ahụla ihe ndị a,
gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi?
“Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume,
nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.
Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha;
ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha.
Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ;
ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha.
Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu,
ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ,
ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha,
ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ya.
Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla,
dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru.
Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ;
mgbe ọ saghere anya ya abụọ, ihe niile efuola.
Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri;
oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị.
Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ;
ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya.
Ọ na-atụfu ya na-enweghị ebere
mgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya.
Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo,
were ịma ọsụ wezuga ya nʼọnọdụ ya.”
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.