Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 24

“Gịnị mere Onye pụrụ ime ihe niile adịghị ahọpụta oge maka ikpe ikpe?

Gịnị mere ndị maara ya ga-eji na-ele anya nʼefu maka oge ndị a?

Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala,

na-elekọta igwe atụrụ ha zutere nʼohi.

Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei,

ha na-anarakwa ehi nke nwanyị di ya nwụrụ nʼihe ebe.

Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa.

Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha.

Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara,

otu a ka ndị ogbenye si agagharị na-achọgharị ihe oriri,

ala na-adịghị epupụta ihe na-enye ụmụ ha nri.

Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi,

na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume.

Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị,

ha enwekwaghị akwa iji kpuchie onwe ha oyi.

Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ,

ha na-amaku nkume nʼihi enweghị ebe mgbaba.

Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara.

Nwa ọhụrụ nke onye ogbenye ka a na-anara nʼihe ebe.

Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị,

ha na-ebu ukwu ọka ma nọrọ nʼagụụ.

Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya,

ha na-azọchapụta mmanya vaịnị ma akpịrị na-akpọ ha nkụ.

Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili,

mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka.

Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a.

“Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè,

ndị na-amaghị ụzọ ya

maọbụ na-anọgide nʼụzọ ya.

Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili,

gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa;

nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi.

Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji;

ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’

ọ na-ekpuchikwa ihu ya.

Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa,

ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ;

o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ.

Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha,

ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi.

“Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri;

ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ,

nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha.

Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee,

otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike.

Akpanwa na-echefu ha,

ikpuru na-eji ha mere ihe oriri;

anaghị echetakwa ndị ajọọ omume

kama a na-etiji ha dịka osisi.

Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa,

ha adịghị elekọta nwanyị di ya nwụrụ.

Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ,

ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ.

Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha,

ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile.

A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị,

a na-eweda ha nʼala chikọtakwa ha dịka ndị ọzọ,

a na-ebipụ ha dịka ukwu ọka.

“Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye pụrụ ị sị na ihe m kwuru bụ okwu ụgha

si otu a mee ka okwu m bụrụ ihe efu?”

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.