Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 23

Okwu Job

Mgbe ahụ, Job zara sị:

“Ọ bụladị taa, mkpesa m dị ilu;

aka ya dị arọ megide m nʼagbanyeghị ịsụ ude m.

A sịkwa na m maara ebe m ga-achọta ya;

a sịkwa na m nwere ike ijeru ebe obibi ya!

Aga m edozi mkpesa m nʼusoro nʼihu ya

were ịrụ ụka mejuo ọnụ m.

Aga m achọpụta ihe o ga-aza m

ma tuleekwa ihe ọ ga-agwa m.

Ọ ga-eji ike dị egwu megide m?

Mba, ọ gaghị ebo m ebubo.

Nʼebe ahụ, onye ziri ezi ga-eme mkpesa nʼihu ya.

Nʼebe ahụ, a ga-anapụtakwa m site nʼaka onye ikpe m rụọ mgbe ebighị ebi.

“Ma ọ bụrụ na m agaa nʼọwụwa anyanwụ ọ nọghị nʼebe ahụ;

ọ bụrụ na m gaa nʼọdịda anyanwụ, agaghị m achọta ya.

Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya,

mgbe ọ lọghachiri na ndịda anaghị m ahụkwa ya.

Ma ọ maara ụzọ m na-aga,

mgbe ọ nwapụtasịrị m, aga m apụta dịka ọlaedo,

ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya;

ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe.

Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m;

a na m echekwa okwu ọnụ ya karịa nri nke m na-eri kwa ụbọchị.

“Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya?

Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya.

Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m,

ọ ka nwekwara nzube ndị ọzọ yiri nke a o dobere imegide m.

Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya;

mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya.

Chineke emeela ka obi m daa mba;

Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka m maa jijiji.

Ma ọchịchịrị emeghị ka m mechie ọnụ m,

bụ oke ọchịchịrị nke kpuchiri ihu m.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.