Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 25

Okwu Bildad

Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị:

“Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke;

Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe.

Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ?

Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị?

Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke?

Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha?

Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta,

ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya,

ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru,

mmadụ, nke bụ naanị idide.”

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.