Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Job 17
Mmụọ m tiwara etiwa,
ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ,
ili na-echere ịnabata m.
Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu;
anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha.
“Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ.
Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe?
I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta;
ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri.
Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya,
anya ụmụ ya ga-ada mba.
“Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla,
meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu.
Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ;
ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ.
Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a;
ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume.
Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha,
ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike.
“Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ!
Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu.
Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi.
Ma ọchịchọ nke obi m
na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie;
nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso.
Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili,
ọ bụrụ na m agbasaa1 ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị,
a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’
maọbụ sị ikpuru ‘Nne m’ maọbụ ‘Nwanne m nwanyị,’
ebeekwa ka olileanya m dị?
Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya?
Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ?
Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?”
Source notes (1)
- Footnote Maọbụ, atụsaa
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.