Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 16

Okwu Job

Mgbe ahụ, Job zara sị:

“Anụla m ọtụtụ ihe dịka ndị a;

ndị nkasiobi na-eweta ọnọdụ ọjọọ ka unu niile bụ.

Ogologo okwu efu ndị a niile unu na-ekwu, ọ naghị akwụsị?

Gịnị bụ nsogbu unu nke mere unu ji aga nʼihu na-arụ ụka niile ndị a?

Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu dịka unu,

ma ọ bụrụ na unu nọ nʼọnọdụ m;

enwere m ike kwuo okwu dị ụtọ na ntị megide unu,

ma fufekwaa isi1 m megide unu.

Ma ọnụ m ga-agba unu ume;

nkasiobi si nʼegbugbere ọnụ m ga-emekwa ka ihe mgbu unu dajụọ.

“Ma ọ bụrụ na m ekwuo, adịghị egbochi ihe mgbu m,

ọ bụrụ na m ahapụ ikwu okwu, ọdịghị esi nʼahụ m pụọ?

Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m,

i tidakwala ezinaụlọ m.

I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m;

ịta ahụ m ebiliela ịgba akaebe megide m.

Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m,

ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m;

onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya.

Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị,

ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo,

jikọtakwa onwe ha megide m.

Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume,

tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu.

Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m.

O jidere m nʼolu ma tiwasịa m.

O meela m ihe ịgba ụta ya;

ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu.

Ọ na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịiko

mee ka oluilu m wụsịa nʼala.

Mgbe niile, ọ na-emegide m;

ọ na-achụso m dịka dike nʼagha.

“Adụkọtala m akwa mkpe were ya kpuchie anụ ahụ m,

liekwa ikuanya2 m nʼime ntụ.

Ihu m na-acha ọbara ọbara site nʼakwa nke m na-akwa,

onyinyo nke ọnwụ dịkwa gburugburu egbugbere anya m abụọ;

ma aka m emeghị ihe ike ọbụla,

ọzọ ekpere m dịkwa ọcha.

“Ala, biko, ezokwala ọbara m;

mee ka akwa m ghara ịbụ ihe lara nʼiyi!

Ọ bụladị ugbu a, onye akaebe m nọ nʼeluigwe,

onye nkwuchite ọnụ m nọ nʼebe dị elu.

Onye na-arịọrọ m arịrịọ bụ enyi m,

dịka m na-awụsara Chineke anya mmiri m.

Nʼọnọdụ mmadụ ka ọ na-arịọ Chineke

dịka mmadụ na-arịọ nʼihi enyi ya.

“Naanị afọ ole na ole ga-agabiga

tupu m ga nʼụzọ nke nlọghachi m na-adịghị.

Source notes (2)
  1. Footnote Ifufe isi nʼihu mmadụ, bụ omume nlelị anya. Ọ pụtara na e nweghị nsọpụrụ nʼebe onye dị otu a nọ. Abụ 22:7; Akw 2:15; Mat 27:39
  2. Footnote Maọbụ, mpi

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.