Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Job 15
Okwu Elifaz
Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:
“Onye maara ihe ọ ga-eji okwu na-abaghị uru zaghachi?
Ọ ga-emeju afọ ya nʼifufe na-ekpo ọkụ nke si nʼọwụwa anyanwụ?
Ọ ga-eji okwu na-abaghị uru rụọ ụka,
maọbụ kwuo okwu na-enweghị isi?
Ma ị na-eleda ezi omume anya
na-egbochikwa ịsọpụrụ Chineke.
Mmehie gị na-eme ka ọnụ gị kwuo okwu ngwangwa;
ọ bụkwa ire ndị aghụghọ ka i nwere.
Ọnụ gị na-ama gị ikpe, ọ bụghị mụ onwe m,
egbugbere ọnụ gị na-ekwu okwu megide gị.
“Ị bụ mmadụ mbụ a mụrụ?
A mụọla gị tupu e kee ugwu niile?
Ọ getụla ntị nʼizu nzuzo nke Chineke?
Amamihe niile ọ bụ nʼime gị ka ha juru?
Gịnị ka ị maara nke anyị na-amaghị?
Ụdị nghọta dị aṅaa ka i nwere nke anyị na-enweghị?
Ndịisi awọ na ndị kara nka nọ nʼetiti anyị,
ndị ikom mere agadi karịa nna mụrụ gị.
Ọ ga-abụ na nkasiobi Chineke bụrụ gị ihe nta,
ka ọ bụ okwu dị nro nke ọ gwara gị?
Gịnị mere obi gị ji duhie gị,
gịnị mekwara anya gị abụọ ji chagharịa,
nke mere iwe gị jiri dị ọkụ megide Chineke,
meekwa ka okwu ọjọọ ndị a niile si nʼọnụ gị pụta?
“Gịnị ka mmadụ efu bụ, ọ ga-eji dị ọcha nʼobi,
gịnị ka mmadụ nwanyị mụrụ bụ, na ha nwere ike ị bụ ndị ezi omume?
Ọ bụrụ na Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi,
ọ bụrụkwa na eluigwe adịghị ọcha nʼanya ya,
ọ ga-esi aṅaa tụkwasị mmadụ efu onye rụrụ arụ obi,
bụ onye na-aṅụ ajọ omume dịka mmiri.
“Gee m ntị ka m kọwaara gị;
kwerekwa ka m gwa gị ihe m hụrụ,
bụ ihe ndị amamihe kwuru,
ndị na-ezobeghị ihe ha natara nʼaka nna nna ha,
bụ ndị e nyefere ala ndị a nʼaka ha
mgbe ọ dịghị onye ọbịa gabigara nʼetiti ha.
Ụbọchị ndụ ya niile, onye ajọ omume na-ata ahụhụ mmekpa ahụ,
bụ nke e debere ogologo afọ nye nwoke ahụ na-eme ihe ike.
Ụzụ na-eweta oke egwu na-eju ya ntị,
mgbe ọ dị ka ihe niile na-aga nke ọma, ndị na-apụnara mmadụ ihe na-abịakwasị ya.
O nweghị olileanya ịgbanarị ọchịchịrị;
mma agha nọ na-echere ya.
Ọ na-akpagharị na-achọ ebe nri dịka udele;
ọ makwara na ụbọchị ọchịchịrị nọ nso.
Ahụhụ na mkpagbu na-eme ka ọ tụọ oke egwu,
nsogbu na-abịakwasị ya dịka eze nke nọ na njikere ibuso ndị iro ya agha.
Nʼihi na ọ na-atụ Chineke aka nʼihu,
dokwaa onwe ya imegide Onye pụrụ ime ihe niile.
O ji ikwesi olu ike,
dịka ọta siri ike, na-emegide Chineke.
“Ọ bụ ezie na abụba kpuchiri ihu ya,
abụba nke dị nʼukwu ya na-eme ka anụ ahụ nupụtakwa,
ọ ga-ebi nʼobodo e bibiri ebibi,
nʼụlọ nke mmadụ na-ekwesighị ibi nʼime ha,
ụlọ nke na-adakasị adakasị.
Ma ọ gaghị aga nʼihu ị bụ ọgaranya, akụ ya agaghị adịgidekwa.
Ihe o nwere agakwaghị agbasapụ nʼala niile ahụ.
Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị,
ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ,
iku ume nke ọnụ Chineke ga-ebufu ya.
Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu,
nʼihi na ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọbụla ọ ga-enweta.
Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju,
ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ
Ọ ga-adị ka osisi vaịnị nke mkpụrụ ya dapụsịrị na-achaghị acha,
dịka osisi oliv nke akwụkwọ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke ga-adị ka nwanyị aga,
ọkụ ga-erepịa ụlọ ikwu niile nke ndị hụrụ iri ngarị nʼanya.
Ha na-atụrụ ihe ọjọọ dịka ime, ma mụọkwa ajọọ omume;
naanị aghụghọ ka akpanwa ha na-arụpụta.”
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.