Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Job 18
Okwu Bildad
Mgbe ahụ Bildad onye Shua zara sị:
“Ruo ole mgbe ka ị ga-ekwubi okwu ndị a ị na-ekwu?
Nwee ezi uche ka anyị kparịtaa ụka.
Gịnị mere i ji were anyị dịka anụ ọhịa,
gụọ anyị dịka ndị na-enweghị uche nʼanya gị?
Gị onye na-eji iwe adọkasị onwe gị,
a ga-ahapụ ụwa nʼihi gị?
Ka a ga-enupu oke nkume nʼọnọdụ ha?
“A na-afụnyụ oriọna nke onye na-emebi iwu;
ire ọkụ ya ga-akwụsịkwa inwu enwu,
ìhè nke dị nʼime ụlọ ikwu ya na-abụ ọchịchịrị,
oriọna nke dị nʼakụkụ ya na-anyụkwa.
Ike agakwaghị adị na nzọ ukwu ya;
atụmatụ ya onwe ya ga-atụda ya nʼala.
Ụkwụ ya na-eduba ya nʼọnya;
ọ na-akpagharị na-adaba nʼime oghere.
Ọnya na-ejide ikiri ụkwụ ya,
ọnya ahụ na-ejidesi ya ike.
E zobere ya ụdọ ọnya igbudu nʼala,
ihe e ji ejide ya na-echere ya nʼụzọ ya.
Ihe egwu na-emenye ya ụjọ nʼakụkụ niile,
na-agbasokwa nzọ ụkwụ ya niile.
Ịla nʼiyi na-achọsi ya ike;
mbibi nọkwa na njikere na-eche mgbe ọ ga-ada.
Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya;
ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile.
Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya
duru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile.
Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya;
a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya.
Mgbọrọgwụ ya na-akpọ nkụ nʼime ala,
alaka ya ga-akpọnwụ nʼelu.
A gaghị echeta echiche ya nʼụwa ọzọ,
o nweghị onye ọbụla na-echetakwa aha ya.
A na-esite nʼìhè chụba ya nʼọchịchịrị,
otu a kwa, a na-achụpụkwa ya site nʼụwa.
O nweghị ụmụ, o nwekwaghị ụmụ ụmụ nʼetiti ndị ya,
ọ dịghị onye fọdụrụ nʼebe o bi na mbụ.
Ọnọdụ ya na-eju ndị si nʼọdịda anyanwụ anya;
oke egwu na-ejidekwa ndị si nʼọwụwa anyanwụ nʼihi ya.
Nʼezie, otu a ka ebe obibi nke onye ajọ omume dị,
ee, bụ onye ahụ nke na-amaghị Chineke.”
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.