Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ nke Abụ 2

Onye a hụrụ nʼanya

Abụ m okoko osisi ọhịa nke Sharọn,1

na okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu.

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu,

otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ.

Onye a hụrụ nʼanya

Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa,

mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ.

Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya,

mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ.

Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri,

ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya.

Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume;

werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike,

nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa.

Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,

aka nri ya na-ejikụ m.

Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,

eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị:

Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta,

ruo mgbe ọ masịrị ya.

Gee ntị! Onye m hụrụ nʼanya!

Lee ya ka ọ na-abịa,

na-amali elu nʼelu ugwu niile,

na-amafekwa nʼelu ugwu nta niile.

Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele.

Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị,

ọ na-esikwa na oghereikuku

na nʼoghere dị ya na-elebata anya.

Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m,

“Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ,

onye m mara mma, soro m.

Lee, oge oyi agafeela,

udu mmiri agabigakwala.

Okoko osisi epupụtala nʼala;

oge eji agụ egwu eruokwala,

a na-anụ abụ nduru

nʼala anyị niile.

Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,2

isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile.

Bilie, ma bịa, ọmasịrị m.

Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

Nduru m nọ nʼọgba nkume,

nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu,

gosi m ihu gị,

mee ka m nụ olu gị,

nʼihi na olu gị dị ụtọ,

ihu gị makwara mma.

Jidenụ nkịta ọhịa,

ụmụ nkịta ọhịa niile

na-emebiri anyị ubi,

ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko.

Onye a hụrụ nʼanya

Onye m hụrụ nʼanya bụ nke m, mụ onwe m bụkwa nke ya.

Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi,

tutu chi ụtụtụ abọọ

mgbe onyinyo niile na-agabigakwa.

Tụgharịa, onye m hụrụ nʼanya,

dị ka mgbada

maọbụ nwa ele

nke nọ nʼelu ugwu.

Source notes (2)
  1. Footnote Okoko osisi a bụ otu nʼime okoko osisi ndị na-epu nʼọkọchị, na ndịda akụkụ osimiri Kamel Aịz 35:1-2
  2. Footnote Osisi fiig na-amị mkpụrụ ugboro abụọ nʼafọ nʼIzrel. Ọ bụ nʼoge ọkọchị ka ọ kachasị amị mkpụrụ, amaokwu a na-ekwu banyere owuwe ihe ubi nke mkpụrụ fiig mbụ.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.