Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ nke Abụ 1
Abụ nke abụ nke Solomọn.
Onye a hụrụ nʼanya
Ya were nsusu niile nke ọnụ ya susuo m ọnụ,
nʼihi na ịhụnanya gị dị ụtọ karịa mmanya.
Mmanụ otite gị niile na-esi isi ọma,
aha gị dịka mmanụ isi ụtọ awụpụtara awụpụta,
ọ bụghị ihe ịtụnanya na ụmụ agbọghọ hụrụ gị nʼanya.
Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa.
Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya.
Ndị Enyi
Anyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị.
Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya.
Onye a hụrụ nʼanya
Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu.
Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya,
unu ụmụ agbọghọ Jerusalem.
Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda1
dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn.
Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji.
Ọ bụ anwụ gbajiri m.
Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m,
zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị,
ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị.
Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya,
ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri?
Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie?
Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihu
nʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị.
Ndị Enyi
Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma,
soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ
meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa
dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ.
Onye hụrụ ibe ya nʼanya
Ana m atụnyere gị, gị onye m hụrụ nʼanya dịka nne ịnyịnya
e kenyere nʼotu ụgbọ agha Fero.
Agba nti gị ka e jiri ọlantị chọọ mma,
olu gị kwa ka e jiri nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị chọọ mma.
Anyị ga-emere gị ọlantị dị iche iche nke ọlaedo,
nke e ji ọlaọcha chọọ mma.
Onye a hụrụ nʼanya
Mgbe eze nọ na tebul ya,
mmanụ isi ọma m tere sijuru ebe niile.
Onye m hụrụ dị m ka ụda máá2 e kechiri nʼakpa
nke dị nʼetiti ara m abụọ.
Onye m hụrụ nʼanya dịrị m ka ụyọkọ ukwu okoko henna3
nke sitere nʼogige ubi vaịnị En-Gedi.4
Onye hụrụ ibe ya nʼanya
Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya.
Leenụ ka ị si maa mma!
Anya gị dịka nduru.
Onye a hụrụ nʼanya
Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma nwoke.
E, ị mara mma.
Ebe ndina anyị dịka ahịhịa ndụ.
Onye hụrụ ibe ya nʼanya
Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida,
ntuhie ya bụkwa osisi fịa.
Source notes (4)
- Footnote Ndị Keda bụ otu ebo nʼetiti ndị Arab, obodo ha dị na ndịda ọdịda anyanwụ Edọm. Ha na-ebi nʼụlọ ikwu e ji ajị ewu ojii wuo
- Footnote Ụda máá bụ eso e ji eme ihe otite na-esi isi ụtọ. A na-ewepụta eso ndị a nʼosisi Balsam nke na-eto nʼobodo Kush, nʼetiti ọwụwa anyanwụ nakwa India.
- Footnote Okoko osisi henna bụ ahịhịa isi ọma a na-eji emepụta senti.
- Footnote Bụ odo mmiri dị nʼọdịda osimiri nwụrụ anwụ. Ọtụtụ osisi nke a na-esi na ha enweta eso na-esi isi ọma, jupụtara nʼebe ahụ.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.