Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 91

Chineke onye na-echebe anyị

Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu

ga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile.

Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, “Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike,

Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m.”

Nʼezie, ọ ga-anapụta gị

site nʼọnya nke onye osi ọnya

na site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi.

Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị.

Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ,

ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta.

Ị gaghị atụ egwu ihe ịtụ oke egwu nke abalị,

maọbụ àkụ na-efegharị nʼehihie,

maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe, nke na-ejegharị nʼọchịchịrị,

ma ọ bụkwanụ ihe mbibi mberede na-eme nʼehihie.

Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị,

iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị,

ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso.

Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ

ntaramahụhụ nke ndị ajọ omume.

Ọ bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị,

ọ bụladị Onyenwe anyị, onye bụ ebe mgbaba m,

mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị;

ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso.

Nʼihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị,

ka ha chebe gị nʼụzọ gị niile.1

Ha ga-eji ọbụ aka ha,

bulie gị elu ime ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.

Ị ga-azọkwasị ọdụm na ajụala ụkwụ,

zọgbukwaa ọdụm na-akpa ike, na agwọ ọjọọ.

“Nʼihi na ọ hụrụ m nʼanya, Mụ onwe m ga-agbapụta ya, ka Onyenwe anyị kwuru;

aga m echebe ya, nʼihi na ọ maara aha m.

Ọ ga-akpọku m, aga m azakwa ya.

Aga m anọnyere ya nʼime nsogbu ya,

aga m adọpụta, ma sọpụrụkwa ya.2

Aga m eji ogologo ndụ mee ka afọ ju ya,

gosikwa ya nzọpụta m.”

Source notes (2)
  1. Footnote Abụ 34:7; Mat 4:6; Luk 4:10; Hib 1:14
  2. Footnote Job 12:4; Abụ 50:15; Aịz 43:2

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.