Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 9
Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Ọnwụ nke Ọkpara.” Abụ ọma Devid.
Ekele nʼihi nnapụta Chineke
O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị,
aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme.
Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị,
aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu.
Ndị iro m na-alaghachi azụ,
ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị.
I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi,
nʼocheeze gị ka ị nọdụrụ na-ekpe ikpe ziri ezi.
I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi,
hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi.
Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m,
I hopukwala obodo ha niile.
Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ.
Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi.
Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe;
jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile.
Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.
Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.
Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn.
Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya.
Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe;
ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya.
O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m!
Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ,
ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị
nʼọnụ ụzọ ama1 niile nke ada Zayọn,
nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị.
Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru;
ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha.
Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi;
ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. Sela
Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili;
nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke.
Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa;
olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu.
O Onyenwe anyị, bilie! Ekwela ka mmadụ nwee mmeri ọbụla nʼebe ị nọ;
ka e kpee mba niile ikpe nʼihu gị.
O Onyenwe anyị! Mee ka ha maa jijiji nʼoke egwu;
mee ka mba niile ghọta na ha bụ naanị mmadụ. Sela
Source notes (1)
- Footnote Ọ bụ nʼụzọ ama obodo ka a na-anọ akparị ụka niile dị mkpa. Rut 4:1
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.