Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 8
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nʼusoro gittit.
Ịdị ebube Chineke na nsọpụrụ nke mmadụ
O Onyenwe anyị Onyenwe anyị,
lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile!
I meela ka ebube gị dị elu
nʼime eluigwe.
Site nʼotuto1 ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara,
ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị,
ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ.
Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe,
hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ,
mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando
i tinyere nʼọnọdụ ha,
gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha?
Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta2 ha?
I mere ka ha3 dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi4 nọ,
I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze.
I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke,
tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.
Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi,
na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile,
na nnụnụ niile,
na azụ niile,
na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.
O Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,
lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile.
Source notes (4)
- Footnote Mat 21:16
- Footnote Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ na ihe banyere ya na-emetụ gị nʼobi
- Footnote Maọbụ, ya
- Footnote Maọbụ, Chineke
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.