Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 85

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora.

Ekpere maka ihuọma

O Onyenwe anyị, i gosila ala gị ihuọma;

i nyeghachila Jekọb akụnụba ya.

I gbagharala ajọ omume ndị gị,

kpuchikwaa mmehie ha niile. Sela

Ị kwụsịla iwe oke iwe gị,

I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa.

Kpọghachi anyị azụ, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,

wezuga iwe gị site nʼebe anyị nọ.

Ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ị ga na-eweso anyị iwe:

Ị ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile?

Ị gaghị eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ

ka ndị gị ṅụrịa ọṅụ nʼime gị?

O Onyenwe anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide,

nyekwa anyị nzọpụta gị.

Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu;

ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo,

ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu.

Nʼezie, nzọpụta ya dị nso1 ndị na-atụ egwu ya,

ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị.

Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala;

ezi omume na udo esutula ọnụ.

Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta,

ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya.

Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma,

ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya.

Ezi omume ga-aga nʼihu ya,

idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.

Source notes (1)
  1. Footnote Aịz 46:13

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.