Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 84

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora nʼusoro gittit.

Agụụ nke ụlọnsọ Chineke

Lee ka ebe obibi gị sị maa mma,

O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile!

Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba,

ịbata nʼogige Onyenwe anyị;

mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu

na-achọ Chineke dị ndụ.

Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi;

eleke achọtakwarala onwe ya akwụ,

ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya,

nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị,

O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m.

Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ;

ha na-eto gị mgbe niile. Sela

Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị,

ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem.

Mgbe ha na-esite na Ndagwurugwu Baka na-agafe,

ha na-eme ya ka ọ bụrụ ebe isi iyi dị iche iche na-asọpụta;

mmiri ozuzo mbụ na-ewere ngọzị niile kpuchie ya.1

Ike ha na-abawanye abawanye,

tutu ha niile nʼotu na otu, abịa guzo nʼihu Chineke na Zayọn.

O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m.

Gee m ntị, gị Chineke nke Jekọb.

Lekwasị anya nʼọta anyị, O Chineke,

jiri ihuọma lekwasị onye gị e tere mmanụ anya.

Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị,

karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ;

ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m,

karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume.

Onyenwe anyị Chineke bụ anyanwụ2 na ọta;

Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ;

ọ naghị egbochi ihe ọma ọbụla

site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ.

O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,

ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụkwasị gị obi.

Source notes (2)
  1. Footnote Na-ewere ọdọ mmiri kpuchie ya
  2. Footnote Aịz 60:19,20; Mkp 21:23

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.